Ekiliziastis 2:14
Ecclesiastes 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
Ecclesiastes 2:14 in English
Ecclesiastes 2:14 · Berean Standard Bible
The wise man has eyes in his head, but the fool walks in darkness. Yet I also came to realize that one fate overcomes them both.
Context
12Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe,
na ịyị ara na nzuzu.
Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme,
karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ? 13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu,
dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị. 14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ
ma isi kpuru onye nzuzu.
Ma achọpụtakwara m
na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu. 15Agwara m onwe m okwu sị,
“Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ.
Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?”
Ekwuru m nʼobi m sị,
“Ihe a bụkwa ihe efu. 16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu.
Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha.
Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.