Native Bible

Ecclesiastes 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.

Ecclesiastes 2:13 in English

Ecclesiastes 2:13 · Berean Standard Bible

And I saw that wisdom exceeds folly, just as light exceeds darkness:

Context

11Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru. 12Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ? 13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị. 14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu. 15Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.