Ekiliziastis 2:11
Ecclesiastes 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.
Ecclesiastes 2:11 in English
Ecclesiastes 2:11 · Berean Standard Bible
Yet when I considered all the works that my hands had accomplished and what I had toiled to achieve, I found everything to be futile, a pursuit of the wind; there was nothing to be gained under the sun.
Context
9E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee. 10Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere;
egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla.
Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile,
nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m. 11Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka,
otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha,
mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe.
Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru. 12Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe,
na ịyị ara na nzuzu.
Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme,
karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ? 13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu,
dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.