Ekiliziastis 2:16
Ecclesiastes 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
Ecclesiastes 2:16 in English
Ecclesiastes 2:16 · Berean Standard Bible
For there is no lasting remembrance of the wise, just as with the fool, seeing that both will be forgotten in the days to come. Alas, the wise man will die just like the fool!
Context
14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ
ma isi kpuru onye nzuzu.
Ma achọpụtakwara m
na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu. 15Agwara m onwe m okwu sị,
“Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ.
Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?”
Ekwuru m nʼobi m sị,
“Ihe a bụkwa ihe efu. 16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu.
Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha.
Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.” 17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe. 18Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.