Ekiliziastis 2:17
Ecclesiastes 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
Ecclesiastes 2:17 in English
Ecclesiastes 2:17 · Berean Standard Bible
So I hated life, because the work that is done under the sun was grievous to me. For everything is futile and a pursuit of the wind.
Context
15Agwara m onwe m okwu sị,
“Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ.
Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?”
Ekwuru m nʼobi m sị,
“Ihe a bụkwa ihe efu. 16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu.
Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha.
Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.” 17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe. 18Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m. 19Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.