Native Bible

Ecclesiastes 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.

Ecclesiastes 2:19 in English

Ecclesiastes 2:19 · Berean Standard Bible

And who knows whether that man will be wise or foolish? Yet he will take over all the labor at which I have worked skillfully under the sun. This too is futile.

Context

17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe. 18Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m. 19Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu. 20Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 21Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.