Diuteronomi 33:22
Deuteronomy 33:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”
Deuteronomy 33:22 in English
Deuteronomy 33:22 · Berean Standard Bible
Concerning Dan he said: “Dan is a lion’s cub, leaping out of Bashan.”
Context
20Banyere Gad, o kwuru sị,
“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.
Gad na-ebi dịka ọdụm,
na-adọkapụ aka maọbụ isi. 21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya;
oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya.
Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ,
o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi,
na ikpe ya niile banyere Izrel.” 22Banyere Dan, o kwuru sị,
“Dan bụ nwa ọdụm,
onye na-esi na Bashan mapụta.” 23Banyere Naftalị, o kwuru sị,
“Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị,
o jupụtakwara na ngọzị ya,
ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” 24Banyere Asha, o kwuru sị,
“Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ,
ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ,
ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.