Diuteronomi 33:21
Deuteronomy 33:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”
Deuteronomy 33:21 in English
Deuteronomy 33:21 · Berean Standard Bible
He chose the best land for himself, because a ruler’s portion was reserved for him there. He came with the leaders of the people; he administered the LORD’s justice and His ordinances for Israel.”
Context
19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu,
nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume,
ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri,
site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” 20Banyere Gad, o kwuru sị,
“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.
Gad na-ebi dịka ọdụm,
na-adọkapụ aka maọbụ isi. 21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya;
oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya.
Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ,
o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi,
na ikpe ya niile banyere Izrel.” 22Banyere Dan, o kwuru sị,
“Dan bụ nwa ọdụm,
onye na-esi na Bashan mapụta.” 23Banyere Naftalị, o kwuru sị,
“Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị,
o jupụtakwara na ngọzị ya,
ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.