Native Bible

Deuteronomy 33:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.

Deuteronomy 33:20 in English

Deuteronomy 33:20 · Berean Standard Bible

Concerning Gad he said: “Blessed is he who enlarges the domain of Gad! He lies down like a lion and tears off an arm or a head.

Context

18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. 19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” 20Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi. 21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.” 22Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.