Diuteronomi 33:20
Deuteronomy 33:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.
Deuteronomy 33:20 in English
Deuteronomy 33:20 · Berean Standard Bible
Concerning Gad he said: “Blessed is he who enlarges the domain of Gad! He lies down like a lion and tears off an arm or a head.
Context
18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị,
“Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị,
ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. 19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu,
nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume,
ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri,
site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” 20Banyere Gad, o kwuru sị,
“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.
Gad na-ebi dịka ọdụm,
na-adọkapụ aka maọbụ isi. 21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya;
oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya.
Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ,
o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi,
na ikpe ya niile banyere Izrel.” 22Banyere Dan, o kwuru sị,
“Dan bụ nwa ọdụm,
onye na-esi na Bashan mapụta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.