Diuteronomi 33:18
Deuteronomy 33:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.
Deuteronomy 33:18 in English
Deuteronomy 33:18 · Berean Standard Bible
Concerning Zebulun he said: “Rejoice, Zebulun, in your journeys, and Issachar, in your tents.
Context
16na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile,
na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ.
Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef,
nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya. 17Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ,
mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa.
Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile
ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa.
Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị
otu a ka imerime puku ndị Manase dị.” 18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị,
“Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị,
ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. 19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu,
nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume,
ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri,
site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” 20Banyere Gad, o kwuru sị,
“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.
Gad na-ebi dịka ọdụm,
na-adọkapụ aka maọbụ isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.