Native Bible

Deuteronomy 33:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.

Deuteronomy 33:16 in English

Deuteronomy 33:16 · Berean Standard Bible

with the choice gifts of the land and everything in it, and with the favor of Him who dwelt in the burning bush. May these rest on the head of Joseph and crown the brow of the prince of his brothers.

Context

14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, 15na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ, 16na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya. 17Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.” 18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.