Diuteronomi 33:14
Deuteronomy 33:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,
Deuteronomy 33:14 in English
Deuteronomy 33:14 · Berean Standard Bible
with the bountiful harvest from the sun and the abundant yield of the seasons,
Context
12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,
“Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.
Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.
Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.” 13Banyere Josef o kwuru sị,
“Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya,
ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu,
na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, 14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta,
na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, 15na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie,
na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ, 16na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile,
na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ.
Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef,
nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.