Diuteronomi 33:13
Deuteronomy 33:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Josef o kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,
Deuteronomy 33:13 in English
Deuteronomy 33:13 · Berean Standard Bible
Concerning Joseph he said: “May his land be blessed by the LORD with the precious dew from heaven above and the deep waters that lie beneath,
Context
11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị,
ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.
Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,
tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” 12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,
“Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.
Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.
Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.” 13Banyere Josef o kwuru sị,
“Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya,
ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu,
na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, 14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta,
na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, 15na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie,
na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.