Diuteronomi 33:12
Deuteronomy 33:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
Deuteronomy 33:12 in English
Deuteronomy 33:12 · Berean Standard Bible
Concerning Benjamin he said: “May the beloved of the LORD rest secure in Him; God shields * him all day long, and upon His shoulders he rests.”
Context
10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,
na-akụzikwara Izrel iwu gị.
Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,
na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. 11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị,
ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.
Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,
tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” 12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,
“Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.
Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.
Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.” 13Banyere Josef o kwuru sị,
“Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya,
ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu,
na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, 14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta,
na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.