Native Bible

Deuteronomy 33:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.

Deuteronomy 33:10 in English

Deuteronomy 33:10 · Berean Standard Bible

He will teach Your ordinances to Jacob and Your law to Israel; he will set incense before You and whole burnt offerings on Your altar.

Context

8Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. 11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” 12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.