Diuteronomi 33:10
Deuteronomy 33:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
Deuteronomy 33:10 in English
Deuteronomy 33:10 · Berean Standard Bible
He will teach Your ordinances to Jacob and Your law to Israel; he will set incense before You and whole burnt offerings on Your altar.
Context
8Banyere Livayị o kwuru sị,
“Urim na Tumim gị dịịrị
ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,
gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,
‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’
Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,
ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.
Ma o debere okwu gị,
cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,
na-akụzikwara Izrel iwu gị.
Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,
na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. 11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị,
ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.
Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,
tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” 12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,
“Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.
Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.
Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.