Native Bible

Deuteronomy 33:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.

Deuteronomy 33:8 in English

Deuteronomy 33:8 · Berean Standard Bible

Concerning Levi he said: “Give Your Thummim to Levi and Your Urim to Your godly one,* whom You tested at Massah * and contested at the waters of Meribah.*

Context

6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.” 7Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” 8Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.