Diuteronomi 33:8
Deuteronomy 33:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.
Deuteronomy 33:8 in English
Deuteronomy 33:8 · Berean Standard Bible
Concerning Levi he said: “Give Your Thummim to Levi and Your Urim to Your godly one,* whom You tested at Massah * and contested at the waters of Meribah.*
Context
6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ,
ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.” 7Ihe a ka o kwuru banyere Juda,
“Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda,
kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ.
Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche.
Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” 8Banyere Livayị o kwuru sị,
“Urim na Tumim gị dịịrị
ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,
gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,
‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’
Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,
ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.
Ma o debere okwu gị,
cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,
na-akụzikwara Izrel iwu gị.
Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,
na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.