Diuteronomi 33:7
Deuteronomy 33:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.”
Deuteronomy 33:7 in English
Deuteronomy 33:7 · Berean Standard Bible
And concerning Judah he said: “O LORD, hear the cry of Judah and bring him to his people. With his own hands he defends his cause, but may You be a help against his foes.”
Context
5Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun,
mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ
ha na ebo niile nke Izrel. 6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ,
ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.” 7Ihe a ka o kwuru banyere Juda,
“Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda,
kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ.
Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche.
Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” 8Banyere Livayị o kwuru sị,
“Urim na Tumim gị dịịrị
ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,
gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,
‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’
Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,
ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.
Ma o debere okwu gị,
cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.