Diuteronomi 33:9
Deuteronomy 33:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.
Deuteronomy 33:9 in English
Deuteronomy 33:9 · Berean Standard Bible
He said of his father and mother, ‘I do not consider them.’ He disregarded his brothers and did not know his own sons, for he kept * Your word and maintained Your covenant.
Context
7Ihe a ka o kwuru banyere Juda,
“Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda,
kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ.
Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche.
Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” 8Banyere Livayị o kwuru sị,
“Urim na Tumim gị dịịrị
ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,
gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,
‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’
Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,
ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.
Ma o debere okwu gị,
cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,
na-akụzikwara Izrel iwu gị.
Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,
na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. 11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị,
ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.
Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,
tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.