Native Bible

Deuteronomy 33:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya.

Deuteronomy 33:24 in English

Deuteronomy 33:24 · Berean Standard Bible

And concerning Asher he said: “May Asher be the most blessed of sons; may he be the most favored among his brothers and dip his foot in oil.

Context

22Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.” 23Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” 24Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya. 25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.