Diuteronomi 33:24
Deuteronomy 33:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya.
Deuteronomy 33:24 in English
Deuteronomy 33:24 · Berean Standard Bible
And concerning Asher he said: “May Asher be the most blessed of sons; may he be the most favored among his brothers and dip his foot in oil.
Context
22Banyere Dan, o kwuru sị,
“Dan bụ nwa ọdụm,
onye na-esi na Bashan mapụta.” 23Banyere Naftalị, o kwuru sị,
“Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị,
o jupụtakwara na ngọzị ya,
ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” 24Banyere Asha, o kwuru sị,
“Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ,
ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ,
ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya. 25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe,
dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,
onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,
onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.