Native Bible

Deuteronomy 33:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.

Deuteronomy 33:26 in English

Deuteronomy 33:26 · Berean Standard Bible

“There is none like the God of Jeshurun, who rides the heavens to your aid, and the clouds in His majesty.

Context

24Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya. 25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’ 28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.