Diuteronomi 33:26
Deuteronomy 33:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.
Deuteronomy 33:26 in English
Deuteronomy 33:26 · Berean Standard Bible
“There is none like the God of Jeshurun, who rides the heavens to your aid, and the clouds in His majesty.
Context
24Banyere Asha, o kwuru sị,
“Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ,
ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ,
ka o jirikwa mmanụ* saa ụkwụ ya. 25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe,
dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,
onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,
onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.
Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.
Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,
‘Bibie ha!’ 28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo,
isi iyi mmiri Jekọb dị chịm,
nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.