Diuteronomi 33:27
Deuteronomy 33:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’
Deuteronomy 33:27 in English
Deuteronomy 33:27 · Berean Standard Bible
The eternal God is your dwelling place, and underneath are the everlasting arms. He drives out the enemy before you, giving the command, ‘Destroy him!’
Context
25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe,
dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,
onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,
onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.
Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.
Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,
‘Bibie ha!’ 28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo,
isi iyi mmiri Jekọb dị chịm,
nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
ebe igirigi nke eluigwe na-ada. 29Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel,
onye dị ka gị
ndị Onyenwe anyị zọpụtara?
Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị,
na mma agha gị dị ebube.
Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị,
ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
33:24 Mmanụ bụ ihe ngosi na mmadụ bụ ọgaranya nʼọrụ ubi, nke kachasị, ọ bụrụ na onye dị otu a na-akọ mkpụrụ oliv nke e si na ya emepụta mmanụ. Jen 49:20; Job 29:6.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.