Diuteronomi 33:28
Deuteronomy 33:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
Deuteronomy 33:28 in English
Deuteronomy 33:28 · Berean Standard Bible
So Israel dwells securely; the fountain of Jacob lives untroubled in a land of grain and new wine, where even the heavens drip with dew.
Context
26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,
onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,
onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.
Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.
Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,
‘Bibie ha!’ 28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo,
isi iyi mmiri Jekọb dị chịm,
nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
ebe igirigi nke eluigwe na-ada. 29Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel,
onye dị ka gị
ndị Onyenwe anyị zọpụtara?
Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị,
na mma agha gị dị ebube.
Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị,
ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
33:24 Mmanụ bụ ihe ngosi na mmadụ bụ ọgaranya nʼọrụ ubi, nke kachasị, ọ bụrụ na onye dị otu a na-akọ mkpụrụ oliv nke e si na ya emepụta mmanụ. Jen 49:20; Job 29:6.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.