Native Bible

Deuteronomy 33:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.

Deuteronomy 33:28 in English

Deuteronomy 33:28 · Berean Standard Bible

So Israel dwells securely; the fountain of Jacob lives untroubled in a land of grain and new wine, where even the heavens drip with dew.

Context

26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’ 28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada. 29Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị Onyenwe anyị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.” 33:24 Mmanụ bụ ihe ngosi na mmadụ bụ ọgaranya nʼọrụ ubi, nke kachasị, ọ bụrụ na onye dị otu a na-akọ mkpụrụ oliv nke e si na ya emepụta mmanụ. Jen 49:20; Job 29:6.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.