Diuteronomi 32:9
Deuteronomy 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
Deuteronomy 32:9 in English
Deuteronomy 32:9 · Berean Standard Bible
But the LORD’s portion is His people, Jacob His allotted inheritance.
Context
7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,
tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga
jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị.
Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya. 8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,
mgbe o kesara ụmụ mmadụ,
mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile
dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. 9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya
Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. 10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,
nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ.
O kpuchitere ya, lezie ya anya,
o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, 11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,
nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,
nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,
nke na-ebu ha na nku ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.