Diuteronomi 32:11
Deuteronomy 32:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya,
Deuteronomy 32:11 in English
Deuteronomy 32:11 · Berean Standard Bible
As an eagle stirs up its nest and hovers over its young, He spread His wings to catch them and carried them on His pinions.*
Context
9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya
Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. 10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,
nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ.
O kpuchitere ya, lezie ya anya,
o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, 11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,
nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,
nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,
nke na-ebu ha na nku ya, 12Onyenwe anyị naanị ya duru ya,
chi ala ọzọ esokwaghị ya. 13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ,
jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya.
O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya,
ya na mmanụ si nʼoke nkume,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.