Diuteronomi 32:13
Deuteronomy 32:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,
Deuteronomy 32:13 in English
Deuteronomy 32:13 · Berean Standard Bible
He made him ride on the heights of the land and fed him the produce of the field. He nourished him with honey from the rock and oil from the flinty crag,
Context
11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,
nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,
nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,
nke na-ebu ha na nku ya, 12Onyenwe anyị naanị ya duru ya,
chi ala ọzọ esokwaghị ya. 13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ,
jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya.
O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya,
ya na mmanụ si nʼoke nkume, 14na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ,
na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba,
na oke ebule Bashan dị ezi mma,
tinyere ezi obi ọka wiiti.
Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị. 15Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya,
ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya.
Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya,
jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.