Diuteronomi 32:10
Deuteronomy 32:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
Deuteronomy 32:10 in English
Deuteronomy 32:10 · Berean Standard Bible
He found him in a desert land, in a barren, howling wilderness; He surrounded him, He instructed him, He guarded him as the apple * of His eye.
Context
8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,
mgbe o kesara ụmụ mmadụ,
mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile
dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. 9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya
Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. 10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,
nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ.
O kpuchitere ya, lezie ya anya,
o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, 11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,
nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,
nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,
nke na-ebu ha na nku ya, 12Onyenwe anyị naanị ya duru ya,
chi ala ọzọ esokwaghị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.