Native Bible

Deuteronomy 32:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,

Deuteronomy 32:10 in English

Deuteronomy 32:10 · Berean Standard Bible

He found him in a desert land, in a barren, howling wilderness; He surrounded him, He instructed him, He guarded him as the apple * of His eye.

Context

8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. 9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. 10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, 11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya, 12Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.