Native Bible

Deuteronomy 32:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.

Deuteronomy 32:31 in English

Deuteronomy 32:31 · Berean Standard Bible

For their rock is not like our Rock, even our enemies concede.*

Context

29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ. 30Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ? 31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo. 32Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu. 33Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.