Diuteronomi 32:29
Deuteronomy 32:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.
Deuteronomy 32:29 in English
Deuteronomy 32:29 · Berean Standard Bible
If only they were wise, they would understand it; they would comprehend their fate.
Context
27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,
ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị,
‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri,
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ” 28Ha bụ mba na-enweghị uche,
ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha. 29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche
nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ. 30Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,
kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ,
ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha,
ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ? 31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị,
dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.