Diuteronomi 32:30
Deuteronomy 32:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ?
Deuteronomy 32:30 in English
Deuteronomy 32:30 · Berean Standard Bible
How could one man pursue a thousand, or two put ten thousand to flight, unless their Rock had sold them, unless the LORD had given them up?
Context
28Ha bụ mba na-enweghị uche,
ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha. 29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche
nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ. 30Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,
kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ,
ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha,
ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ? 31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị,
dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo. 32Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm,
na nʼubi dị na Gọmọra
mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi,
ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.