Native Bible

Deuteronomy 32:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ”

Deuteronomy 32:27 in English

Deuteronomy 32:27 · Berean Standard Bible

if I had not dreaded the taunt of the enemy, lest their adversaries misunderstand and say: ‘Our own hand has prevailed; it was not the LORD who did all this.’”

Context

25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. 26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ. 27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi, ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị, ‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri, ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ” 28Ha bụ mba na-enweghị uche, ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha. 29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.