Diuteronomi 32:26
Deuteronomy 32:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
Deuteronomy 32:26 in English
Deuteronomy 32:26 · Berean Standard Bible
I would have said that I would cut them to pieces and blot out their memory from mankind,
Context
24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,
na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.
Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,
na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. 25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.
Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,
ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. 26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,
hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ. 27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,
ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị,
‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri,
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ” 28Ha bụ mba na-enweghị uche,
ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.