Diuteronomi 32:24
Deuteronomy 32:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.
Deuteronomy 32:24 in English
Deuteronomy 32:24 · Berean Standard Bible
They will be wasted from hunger and ravaged by pestilence and bitter plague; I will send the fangs of wild beasts against them, with the venom of vipers that slither in the dust.
Context
22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,
ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.
Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,
ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. 23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,
zipụ àkụ m niile megide ha. 24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,
na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.
Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,
na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. 25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.
Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,
ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. 26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,
hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.