Native Bible

Deuteronomy 32:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.

Deuteronomy 32:22 in English

Deuteronomy 32:22 · Berean Standard Bible

For a fire has been kindled by My anger, and it burns to the depths of Sheol; it consumes the earth and its produce, and scorches the foundations of the mountains.

Context

20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. 21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. 22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. 23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha. 24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.