Diuteronomi 32:21
Deuteronomy 32:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.
Deuteronomy 32:21 in English
Deuteronomy 32:21 · Berean Standard Bible
They have provoked My jealousy by that which is not God; they have enraged Me with their worthless idols. So I will make them jealous by those who are not a people;* I will make them angry by a nation without understanding.*
Context
19Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,
nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. 20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,
“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,
nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,
ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. 21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,
jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.
Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,
sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. 22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,
ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.
Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,
ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. 23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,
zipụ àkụ m niile megide ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.