Diuteronomi 32:23
Deuteronomy 32:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha.
Deuteronomy 32:23 in English
Deuteronomy 32:23 · Berean Standard Bible
I will heap disasters upon them; I will spend My arrows against them.
Context
21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,
jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.
Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,
sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. 22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,
ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.
Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,
ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. 23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,
zipụ àkụ m niile megide ha. 24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,
na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.
Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,
na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. 25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.
Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,
ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.