Diuteronomi 32:25
Deuteronomy 32:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
Deuteronomy 32:25 in English
Deuteronomy 32:25 · Berean Standard Bible
Outside, the sword will take their children, and inside, terror will strike the young man and the young woman, the infant and the gray-haired man.
Context
23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,
zipụ àkụ m niile megide ha. 24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,
na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.
Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,
na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya. 25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.
Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,
ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ. 26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,
hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ. 27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,
ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị,
‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri,
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.