Diuteronomi 32:19
Deuteronomy 32:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe.
Deuteronomy 32:19 in English
Deuteronomy 32:19 · Berean Standard Bible
When the LORD saw this, He rejected them, provoked to anger by His sons and daughters.
Context
17Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. 18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. 19Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,
nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. 20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,
“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,
nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,
ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. 21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,
jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.
Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,
sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.