Diuteronomi 32:18
Deuteronomy 32:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
Deuteronomy 32:18 in English
Deuteronomy 32:18 · Berean Standard Bible
You ignored the Rock who brought you forth; you forgot the God who gave you birth.
Context
16Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,
meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha. 17Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. 18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. 19Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,
nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. 20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,
“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,
nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,
ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.