Diuteronomi 32:16
Deuteronomy 32:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
Deuteronomy 32:16 in English
Deuteronomy 32:16 · Berean Standard Bible
They provoked His jealousy with foreign gods; they enraged Him with abominations.
Context
14na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ,
na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba,
na oke ebule Bashan dị ezi mma,
tinyere ezi obi ọka wiiti.
Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị. 15Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya,
ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya.
Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya,
jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya. 16Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,
meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha. 17Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. 18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.