Diuteronomi 32:20
Deuteronomy 32:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Deuteronomy 32:20 in English
Deuteronomy 32:20 · Berean Standard Bible
He said: “I will hide My face from them; I will see what will be their end. For they are a perverse generation— children of unfaithfulness.
Context
18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. 19Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,
nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. 20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,
“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,
nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,
ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi. 21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,
jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.
Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,
sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya. 22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,
ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.
Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,
ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.