Daniel 2:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
Daniel 2:20 in English
Daniel 2:20 · Berean Standard Bible
and declared: “Blessed be the name of God forever and ever, for wisdom and power belong to Him.
Context
18Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn. 19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe, 20Daniel sịrị,
“Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
amamihe na ike dị nʼaka ya. 21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche;
Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha.
Ọ na-enye onye maara ihe amamihe,
ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. 22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo;
Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị,
ma ìhè binyekwara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.