Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.

Daniel 2:18 in English

Daniel 2:18 · Berean Standard Bible

urging them to plead for mercy from the God of heaven concerning this mystery, so that Daniel and his friends would not be killed with the rest of the wise men of Babylon.

Context

16Mgbe ahụ, Daniel banyere nʼụlọeze, ịhụ ya. Ọ rịọrọ eze ka o nyetụ ya nwa oge iji kọwaakwara ya ihe nrọ ahụ pụtara. 17Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ. 18Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn. 19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe, 20Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.