Daniel 2:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
Daniel 2:19 in English
Daniel 2:19 · Berean Standard Bible
During the night, the mystery was revealed to Daniel in a vision, and he blessed the God of heaven
Context
17Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ. 18Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn. 19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe, 20Daniel sịrị,
“Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
amamihe na ike dị nʼaka ya. 21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche;
Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha.
Ọ na-enye onye maara ihe amamihe,
ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.