Daniel 2:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
Daniel 2:21 in English
Daniel 2:21 · Berean Standard Bible
He changes the times and seasons; He removes kings and establishes them. He gives wisdom to the wise and knowledge to the discerning.
Context
19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe, 20Daniel sịrị,
“Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
amamihe na ike dị nʼaka ya. 21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche;
Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha.
Ọ na-enye onye maara ihe amamihe,
ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. 22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo;
Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị,
ma ìhè binyekwara ya. 23Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha,
nʼihi na i nyela m amamihe na ike.
I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị,
i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.