Daniel 2:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
Daniel 2:23 in English
Daniel 2:23 · Berean Standard Bible
To You, O God of my fathers, I give thanks and praise, because You have given me wisdom and power. And now You have made known to me what we have requested, for You have made known to us the dream of the king.”
Context
21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche;
Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha.
Ọ na-enye onye maara ihe amamihe,
ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. 22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo;
Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị,
ma ìhè binyekwara ya. 23Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha,
nʼihi na i nyela m amamihe na ike.
I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị,
i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.” 24Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.” 25Mgbe ahụ, Ariok mere ngwangwa duru Daniel gaa nʼihu eze, sị ya, “Achọpụtala m otu onye nʼime ndị Juda a dọtara nʼagha nwere ike ịgwa eze ihe nrọ ya pụtara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.