Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.

Daniel 2:22 in English

Daniel 2:22 · Berean Standard Bible

He reveals the deep and hidden things; He knows what lies in darkness, and light dwells with Him.

Context

20Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya. 21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. 22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya. 23Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.” 24Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.