Emọs 2:5
Amos 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
Amos 2:5 in English
Amos 2:5 · Berean Standard Bible
So I will send fire upon Judah to consume the citadels of Jerusalem.”
Context
3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,
gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”
Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu. 4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,
ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.” 6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,
reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ. 7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,
na-echi ha ọnụ nʼaja,
na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.
Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,
si otu a merụọ aha nsọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.