Native Bible

Amos 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.

Amos 2:6 in English

Amos 2:6 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “For three transgressions of Israel, even four, I will not revoke My judgment, because they sell the righteous for silver and the needy for a pair of sandals.

Context

4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.” 6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ. 7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m. 8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.