Emọs 2:6
Amos 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
Amos 2:6 in English
Amos 2:6 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “For three transgressions of Israel, even four, I will not revoke My judgment, because they sell the righteous for silver and the needy for a pair of sandals.
Context
4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,
ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.” 6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,
reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ. 7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,
na-echi ha ọnụ nʼaja,
na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.
Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,
si otu a merụọ aha nsọ m. 8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,
nʼelu uwe ndị anatara na mbe.
Nʼime ụlọnsọ chi ha,
ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.