Emọs 2:4
Amos 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
Amos 2:4 in English
Amos 2:4 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “For three transgressions of Judah, even four, I will not revoke My judgment, because they reject the Law of the LORD and fail to keep His statutes; they are led astray by the lies in which their fathers walked.
Context
2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,
nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.
Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,
nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. 3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,
gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”
Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu. 4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,
ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.” 6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,
reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.