Emọs 2:3
Amos 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
Amos 2:3 in English
Amos 2:3 · Berean Standard Bible
I will cut off the ruler of Moab and kill all the officials with him,” says the LORD.
Context
1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Moab,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,
mee ha ka ha ghọọ ntụ. 2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,
nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.
Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,
nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. 3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,
gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”
Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu. 4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro. 5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,
ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.